10. Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.
11. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.
12. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.
13. Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.
14. Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi,Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.