8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.
9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.
10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.
11. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.
12. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;Ọdum di n'amá.
14. Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya,Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.
15. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa;Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.
16. Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.
17. Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.
18. Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,Na àkú, na ọnwu;
19. Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?