Ilu 26:7-10 Bible Nso (IGBOB)

7. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.

8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.

10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

Ilu 26