Ilu 26:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya,Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.

3. Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.

4. Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.

5. Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.

6. Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miriKa onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.

7. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.

8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.

10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

11. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.

Ilu 26