Ilu 26:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa;Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.

16. Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.

17. Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.

18. Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,Na àkú, na ọnwu;

19. Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?

20. Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.

21. Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di;Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.

22. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

23. Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọchaKa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.

Ilu 26