1. Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi,Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.
2. Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya,Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.
3. Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.
4. Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.
5. Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.
6. Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miriKa onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.
7. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.
8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.
9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.
10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.
11. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.
12. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;Ọdum di n'amá.
14. Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya,Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.
15. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa;Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.
16. Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.