Ilu 25:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapuKa itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.

20. Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.

21. Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:

22. N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,Jehova gākwughachi kwa gi.

23. Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.

24. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

25. Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà,Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di.

26. Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibiKa onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.

27. Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma:Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.

Ilu 25