1. Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ.
2. Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu:Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.
3. Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya,Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.
4. Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha,Ihe ewe putara onye nānucha ọla:
5. Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze,Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume.
6. Asọpurula onwe-gi n'iru eze,Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku:
7. N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a;Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya,Onye anya-gi abua huworo.
8. Apula ngwa ngwa ise okwu,Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya,Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.