15. Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume;Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:
16. N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ:Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.
17. Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda,Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:
18. Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya,O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.
19. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ;Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.
20. N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ;Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
21. Nwam, tua egwu Jehova na eze:Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:
22. N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili;Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?
23. Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe.Imata iru madu n'ikpé adighi nma.