1. Ekwosola ndi ọjọ ekworo,Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:
2. N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari,Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.
3. Amam-ihe ka eji ewu ulo;Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:
4. Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputaN'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.
5. Onye mara ihe di ike;E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.
6. N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha:Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
7. Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu:Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.
8. Onye nēchè ime ihe ọjọ,Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.
9. Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie:Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.
10. Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu,Ike-gi pere npe.