23. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.
24. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.
25. Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
26. Nwam, nyem obi-gi,Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
27. N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.
28. E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.
29. Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?
30. Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.
31. Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara,Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko,Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:
32. N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta,Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.