Ilu 23:22-29 Bible Nso (IGBOB)

22. Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.

23. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.

24. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.

25. Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.

26. Nwam, nyem obi-gi,Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.

27. N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.

28. E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.

29. Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?

Ilu 23