Ilu 22:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Zulite nwata dika uzọ-ya si di,Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.

7. Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

8. Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.

9. Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

10. Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.

11. Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.

12. Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.

Ilu 22