10. Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.
11. Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.
12. Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.
13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí:N'etiti amá ka agēb͕um.
14. Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.
15. Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.
16. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.
17. Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.