Ilu 22:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù,Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo.

2. Ọgaranya na ob͕eye ezutewo:Onye meworo ha nile bu Jehova.

3. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

4. Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu JehovaBu àkù, na nsọpuru, na ndu.

5. Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya.

6. Zulite nwata dika uzọ-ya si di,Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.

7. Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

8. Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.

9. Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

10. Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.

Ilu 22