Ilu 21:9-26 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

10. Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.

11. Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe:Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.

12. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu;Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.

13. Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

14. Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.

15. Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe;Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.

16. Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu,Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.

17. Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu:Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.

18. Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.

19. Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara,Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.

20. Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe;Ma madu nzuzu nēloda ya.

21. Onye nāb͕aso ezi omume na ebereNāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.

22. Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo,O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.

23. Onye nēdebe ọnu-ya na ire-yaNēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.

24. Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya,Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.

25. Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua;N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.

26. Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku:Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.

Ilu 21