Ilu 21:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu:Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.

9. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

10. Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.

11. Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe:Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.

12. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu;Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.

13. Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

14. Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.

15. Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe;Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.

16. Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu,Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.

Ilu 21