Ilu 21:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù:Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

6. Ikpa àkù site n'ire okwu-ughaBu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.

7. Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha;N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.

8. Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu:Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.

9. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

10. Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.

Ilu 21