Ilu 20:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya,Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.

8. Eze nke nānọkwasi n'oche ikpéJi anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.

9. Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha,Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?

10. Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

11. Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile,Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.

12. Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,Jehova emewo ọbuná ha abua.

13. Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.

14. Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi:Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.

Ilu 20