15. Ọla-edo di, na ọtutu ruby:Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.
16. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
17. Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha;Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.