Ilu 2:7-10 Bible Nso (IGBOB)

7. O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;

8. Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

Ilu 2