16. Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.
17. Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.
18. Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di;Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
19. Onye oké ọnuma ganāra nra:N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.
20. Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
21. Ọtutu èchìchè di n'obi madu;Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.
22. Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.
23. Egwu Jehova nēdubà na ndu:Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju;Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.
24. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa,Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.
25. Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche:Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.
26. Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga,Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.
27. Nwam, rapu inu idọ-aka-na-ntiNke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.
28. Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò:Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.
29. Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche,Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.