14. Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu:Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.
15. Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu;Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
16. Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.
17. Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.
18. Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di;Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
19. Onye oké ọnuma ganāra nra:N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.
20. Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
21. Ọtutu èchìchè di n'obi madu;Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.
22. Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.
23. Egwu Jehova nēdubà na ndu:Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju;Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.