Ilu 17:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo:Ma Onye nānwa obi bu Jehova.

4. Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe;Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.

5. Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

Ilu 17