7. Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.
8. Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume,Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.
9. Obi madu nēchè uzọ-ya:Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.
10. Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze:Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.
11. Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.
12. Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.
13. Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.
14. Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.
15. N'ìhè iru eze ka ndu di;Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.
16. Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma!Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!
17. Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.
18. N'iru ntipia ka npako nāga,Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.
19. Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala,Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.