Ilu 16:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.

8. Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume,Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

9. Obi madu nēchè uzọ-ya:Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

10. Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze:Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.

11. Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.

12. Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.

13. Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.

14. Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.

Ilu 16