7. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma:Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.
8. Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova:Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.
9. Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu:Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.
10. Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ:Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.
11. Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova?Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?
12. Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba:Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.