Ilu 15:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.

21. Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù:Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

22. Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh:Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.

23. Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya:Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!

24. Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ,Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.

25. Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu:Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

26. Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu:Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.

Ilu 15