Ilu 11:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu,Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.

9. Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya:Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume.

10. N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ:Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.

11. Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo:Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya.

12. Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya:Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti.

13. Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo:Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.

Ilu 11