Ilu 11:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo:Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.

14. Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda:Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.

15. Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe:Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi.

16. Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike:Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.

17. Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu:Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu.

18. Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha:Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.

Ilu 11