1. Ilu di iche iche nke Solomon.Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.
2. Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù:Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.
3. Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume:Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu.
4. Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu:Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.