9. N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.
10. Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,Ekwela.
11. Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,Ka ayi che anwu ọbara,Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;
12. Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;
13. Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;
14. Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:
15. Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:
16. N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.
17. N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,N'anya nnunu ọ bula:
18. Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.
19. Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.
20. Amam-ihe nēti nkpu n'èzí;N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;
21. N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;N'oghere ọnu-uzọ-ama nile,N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:
22. Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya?Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?
23. Laghachinu n'iba-nbam:Le, m'gāwupuru unu mọm,M'gēme ka unu mara okwum nile.
24. N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju;Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;
25. Unu we wezuga ndum-ọdum nile,Unu achọghi kwa iba-nbam: