Ilu 1:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.

10. Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,Ekwela.

11. Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,Ka ayi che anwu ọbara,Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;

12. Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;

13. Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;

14. Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15. Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:

16. N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.

17. N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,N'anya nnunu ọ bula:

18. Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.

19. Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.

20. Amam-ihe nēti nkpu n'èzí;N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;

Ilu 1