Ilu 1:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

9. N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.

10. Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,Ekwela.

11. Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,Ka ayi che anwu ọbara,Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;

12. Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;

13. Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;

14. Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15. Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:

16. N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.

17. N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,N'anya nnunu ọ bula:

Ilu 1