15. Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:
16. N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.
17. N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,N'anya nnunu ọ bula:
18. Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.
19. Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.
20. Amam-ihe nēti nkpu n'èzí;N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;
21. N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;N'oghere ọnu-uzọ-ama nile,N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile: