Hosea 8:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Ọ jusiwo nwa-ehi-gi, Sameria; iwem adiwo ọku megide ha: rùe ole mb͕e ka ha nāgaghi-enwe ike ighọ ndi nēmeghi ihe ọjọ?

6. N'ihi na Israel ka ọbuná ihe a si puta; onye-ọ̀kà mere ya, ọ bughi kwa Chineke ka ọ bu: n'ihi na umu-irighiri-ihe ka nwa-ehi Sameria gāghọ.

7. N'ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa oké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi: ọ dighi ọka guzoro eguzo o nwere; ihe-opupú agaghi-eme utu ọka; ọ buru na o me ma eleghi anya, ndi ala ọzọ gēloda ya.

8. Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile.

9. N'ihi na ha onwe-ha arigowo n'Asiria, dika inyinya-ibu-ọhia nke nání ya nọ iche: Efraim egowo ndi nāhu ya nānya.

10. E, mb͕e ha gēgo ha n'etiti mba nile, ub͕u a ka M'gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n'ibu eze ndi-isi gēbo ha.

Hosea 8