8. Fùanu opì-ike nime Gibea, Fùanu opì nime Rema: tienu nkpu agha nime Bet-even: n'azu gi, Benjamin.
9. Efraim gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ubọchi iba-nba: n'etiti ebo nile nke Israel ka M'meworo ka amara ihe kwesiri ntukwasi-obi.
10. Ndi-isi Juda adiwo ka ndi nēwezuga ókè-ala: n'aru ha ka M'gāwukwasi nrubiga-ókè nke iwem dika miri.
11. Onye anēmeb͕u emeb͕u ka Efraim bu, ọ bu onye anāzọpia n'ikpé; n'ihi na o kwere ijeso ihe enyere n'iwu.
12. Ma Mu onwem, dika nla ka M'nādiri Efraim, dika ire-ure ka M'nādiri ulo Juda.