1. Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.
2. Ndi-njehie abamiwo n'ib͕u madu; ma mu onwem bu onye nādọ ha nile aka na nti.
3. Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.