4. Ma otú ọ di, ka onye ọ bula ghara ise okwu, ka onye ọ bula ghara kwa iba nba; n'ihi na ndi-gi di ka ndi nēseso onye-nchu-àjà okwu.
5. I gāsu kwa ngọngọ n'ehihie, ọzọ, onye-amuma gēso kwa gi su ngọngọ n'abali; M'gēme kwa ka nne-gi la n'iyì.
6. Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.
7. Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.