Hosea 2:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Sinu umu-nne-unu ndikom, Ami; si-kwa-nu umu-nne-unu ndinyom, Ruhama.

2. Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n'ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n'iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n'etiti ara-ya abua;

3. ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;

4. ọ bu kwa n'aru umu-ya ndikom ka M'nāgaghi-enwe obi-ebere; n'ihi na umu-ndikom amuru n'ikwa-iko ka ha bu.

5. N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.

6. N'ihi nka, le, M'gaje iji ogwu b͕achi uzọ-gi, M'gāb͕achibido kwa ya ogige, o we ghara ichọputa okporo-uzọ-ya nile.

Hosea 2