8. M'gādakwasi ha dika anu-ọhia bear nke b͕ara aka nwa, M'gādọwa anu-aru b͕ochiri obi-ha: M'gēri ha n'ebe ahu dika ọdum; anu ọhia gādọka ha.
9. Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.
10. Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n'obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi?
11. Enyem i eze n'iwem, anapukwam ya nime nrubiga-ókè nke iwem.
12. Ihe ekechiri ekechi ka ajọ omume Efraim bu; ihe ezobere ezobe ka nmehie-ya bu.
13. Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n'ebe ib͕ọwaputa umu.