Hosea 12:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n'aka ndi-amuma ka M'ji ihe ama àtù.

11. Ọ buru na Gilead bu ajọ ihe, nání ihe-efu ka ha ghọworo; nime Gilgal ha nāchu àjà oke-ehi di iche iche: e, ebe-ichu-àjà nile ha di ka obo-ihe n'ọ̀b͕à ubi.

12. Jekob we b͕alaga n'ọhia Efraim, Israel we fè òfùfè n'ihi nwunye, ọ bu kwa n'ihi nwunye ka o debere aturu.

13. Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.

14. Efraim akpasuwo iwe oké ilu: ọ bu kwa iwusi-ọbara-madu-ya ka Ọ gārapu n'aru ya, ọ bu kwa ita-uta-ya ka Onye-nwe-ya gēnyeghachi ya.

Hosea 12