Hosea 12:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.

2. Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya.

3. Mb͕e ọ nọ n'afọ o jidere nwa-nne-ya n'ikiri-ukwu; ọ bu kwa n'ume-ya ka o jisiri ike n'ebe Chineke nọ:

4. o we jisie ike n'aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka;

5. ọbuná Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha; Jehova bu aha-ncheta-Ya.

6. Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum.

7. Kenean! n'aka-ya ka ihe-ọtùtù aghughọ di: ọ huru imeb͕u emeb͕u n'anya.

Hosea 12