2. O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha.
3. N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?
4. Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.
5. Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.
6. Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.
7. Emewo ka Sameria la n'iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n'elu miri.
8. Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n'ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi.
9. Site n'ubọchi Gibea ka i mehieworo, gi Israel: n'ebe ahu ka ha guzoro; ka agha anēbuso umu ajọ omume we ghara irute ha nime Gibea.