Hosea 10:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.

2. O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha.

3. N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?

4. Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.

Hosea 10