Hosea 1:9-11 Bible Nso (IGBOB)

9. Jehova we si, Kpọ aha-ya Lo-ami: n'ihi na unu onwe-unu abughi ndim, Mu onwem agaghi-abu-kwa-ra unu Chineke.

10. Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.

11. Agāchikọta kwa umu Juda na umu Israel, ha gēdo-kwa-ra onwe-ha otù onye-isi, si n'ala-ha rigopu, n'ihi na ihe uku ka ubọchi Jezreel bu.

Hosea 1