6. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu;
7. M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
8. Mu nwe ọla-ọcha nile, ọ bu kwa Mu nwe ọla-edo nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
9. Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n'ebe a ka M'gēnye udo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.