Hagai 1:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,

2. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Ndi nka siri, Oge ibia erughi, bú oge iwu ulo Jehova.

3. Okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,

4. Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n'ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe?

5. Ma ub͕u a, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu.

Hagai 1