1. Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n'etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.
2. N'ihi na ha esiwo n'umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a.