17. n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem.
18. Ma ihe ọ bula nke gādi gi nma, di kwa umu-nne-gi nma, iwere nke fọduru nime ọla-ọcha na ọla-edo ahu me, dika ọchichọ Chineke-unu si di ka unu gēme.
19. Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n'iru Chineke Jerusalem.
20. Ma nke fọduru n'ihe nile di nkpà nke ulo Chineke-gi, nke gādabayere gi inye, si n'ulo àkù eze nye ya.
21. Anēsite kwa n'akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n'ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa,